Psalms 95

Toonu Onyenwe anyị

1Bịanụ ka anyị jiri ọṅụ bụkuo Onyenwe anyị abụ;
ka anyị tikuo oke nkume nzọpụta anyị mkpu ọṅụ.
2Ka anyị jiri ekele bịakwute ya
jirikwa iti egwu na ịbụ abụ jaa ya mma.

3Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke dị ukwuu,
eze ukwuu kachasị chi niile elu.
4Ebe niile michasịrị emi nke ụwa dị nʼaka ya,
ebe kachasị elu nke ugwu niile bụkwa nke ya.
5Osimiri niile bụ nke ya, nʼihi na ọ bụ ya kere ha,
aka ya kpụrụ ala akọrọ niile.

6Bịanụ ka anyị kpọọ isiala nʼofufe,
ka anyị gbuo ikpere nʼala nʼihu Onyenwe anyị, onye kere anyị;
7nʼihi na ọ bụ Chineke anyị
anyị bụkwa ndị ọ na-azụ dịka atụrụ,
igwe atụrụ ọ na-elekọta anya.

Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya,
8“Unu emela ka obi unu sie ike dịka unu mere na Meriba,
maọbụ dịka unu mere nʼụbọchị ahụ na Masa nʼime ọzara,
9ebe nna nna unu ha nwara m,
nʼagbanyeghị na ha hụrụ ihe niile m mere.
10Iri afọ anọ ka m were iwe megide ọgbọ ahụ;
ekwuru m sị, ‘Ndị a bụ ndị obi ha na-akpafu akpafu site nʼebe m nọ,
ha amatabeghị ụzọ m niile.’
11Nʼihi nke a, aṅụrụ m iyi nʼiwe, sị,
‘Ha agaghị abanye nʼizuike m ma ọlị.’ ”
Copyright information for IboBIU